Hosea 4

Okwu Onyenwe anyị megide Izrel

1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel,
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo
Maọbụ, Onyenwe anyị akpọọla unu ikpe

megide unu ndị bi nʼala a.
“Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya,
ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.
Ịma ihe banyere Chineke adịghị nʼuche unu

2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,
Maọbụ, ịṅụ iyi
ịgha ụgha na igbu mmadụ,
izu ohi na ịkwa iko.
Ọgbaaghara dị nʼebe niile,
ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,
ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,
Maọbụ, na-anwụkwa anwụ

ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,
ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,
ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.
Nʼihi na ndị gị dịka
ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,
ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.
Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.

“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,
aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;
ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ
mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
7Ka ha
Ya bụ, ndị nchụaja
na-abawanye nʼọnụọgụgụ,
otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,
ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
Akwụkwọ Masori na-ede, nsọpụrụ ha ka m gbanwere ka ọ ghọọ ihere

8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.
Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.
Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ
ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.

10“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha.
Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba,
nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị,
were onwe ha nyefee
11nʼaka ịgba akwụna,
na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,
nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
12Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,
na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase.
Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;
ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,
na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,
na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,
ebe ndo ya dị ezi mma.
Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,
ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.

14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,
mgbe ha na-agba akwụna,
maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ
mgbe ha na-akwa iko,
nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,
ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,
ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.

15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,
ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.

“Unu agakwala Gilgal,
unu agakwala ruo Bet-Aven,
unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
16Ndị Izrel dị isiike
dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike.
Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha
dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
17Ifrem na arụsị agbaala ndụ
hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
18Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,
ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;
ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
19Ifufe ga-ebupụ ha,
aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.
Copyright information for IboBIU